Ọpụpụ 10

Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. O kweghị ka ha laa.

Exodus 10:27 (UKJV) But the LORD hardened Pharaoh's heart, and he would not let them go.

25Mosis zara, “Ị ghaghị ịhapụ anyị ka anyị were ihe aja na aja nsure ọkụ, nke anyị chee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.

26Igwe anụ ụlọ anyị ga-esoro anyị. O nweghị ihe ọ bụla anyị ga-ahapụ nʼihi na anyị ga-eji ụfọdụ nʼime ha fee Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Ọ bụkwa naanị mgbe anyị ruru nʼebe ahụ ka anyị nwere ike ịmata ihe anyị ga-eji fee Onyenwe anyị anyị ofufe.”

27Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. O kweghị ka ha laa.

28Fero gwara Mosis sị, “Si nʼihu m pụọ. Lezie anya hụ na ị bịaghị nʼihu m ọzọ. Ụbọchị ọbụla ị nwara bịa nʼihu m, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ.”

29Mosis zaghachiri Fero sị, “Ihe i kwuru dị mma, agaghị m abịakwa nʼihu gị ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.