Ọpụpụ 10

Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

Exodus 10:3 (UKJV) And Moses and Aaron came in unto Pharaoh, and said unto him, Thus says the LORD God of the Hebrews, How long will you refuse to humble yourself before me? let my people go, that they may serve me.

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Jekwuru Fero nʼihi na emeela m ka obi ya, na obi ndị na-ejere ya ozi sie ike, ka m nwee ike rụọ ọrụ ịrịbama ndị a dị iche iche nʼetiti ha.

2Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.”

3Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

4Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.

5Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.