Ọpụpụ 10

Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.

Exodus 10:4 (UKJV) Else, if you refuse to let my people go, behold, tomorrow will I bring the locusts into your coast:

2Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.”

3Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

4Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.

5Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.

6Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.