4Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.
5Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu.
6Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ.
7Ndị na-ejere Fero ozi bịakwutere ya, jụọ ya sị, “Ruo ole mgbe ka nwoke a ga-anọgide na-abụrụ anyị ihe ọnwụnwa? Hapụ ndị a ka ha laa, ka ha nwee ike ife Onyenwe anyị Chineke ha ofufe. Ọ bụ na ị ghọtabeghị na e bibiela Ijipt?”
8Mgbe ahụ, a kpọghachiri Mosis na Erọn azụ nʼihu Fero. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, gaa feenụ Onyenwe anyị Chineke unu ofufe.” Fero jụkwara ha sị, “Olee ndị nʼetiti unu ga-eso unu jee?”