8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.
10Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.
11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.