Ọpụpụ 12

Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.

Exodus 12:11 (UKJV) And thus shall all of you eat it; with your loins girded, your shoes on your feet, and your staff in your hand; and all of you shall eat it in haste: it is the LORD's passover.

9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.

10Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.

11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.

12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.

13Ọbara ahụ unu ga-ete nʼọnụ ibo ụlọ unu ga-abụ ihe ama igosi ebe unu bi, nʼihi na mgbe m hụrụ ọbara ahụ, aga m agafe unu. Ọ nwekwaghị ihe otiti ga-abịakwasị unu mgbe m ga-egbu ndị Ijipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.