22Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ.
23Mgbe Onyenwe anyị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu.
24“Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu.
25Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a.
26Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’