31Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee Onyenwe anyị unu ofufe dịka unu rịọrọ.
32Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.”
33Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.”
34Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha.
35Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe.