Ọpụpụ 12

Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.

Exodus 12:41 (UKJV) And it came to pass at the end of the four hundred and thirty years, even the very same day it came to pass, that all the hosts of the LORD went out from the land of Egypt.

39Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.

40Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.

41Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt.

42Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.

43Onyenwe anyị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.