5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu.
6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya.
7Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.
8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu.
9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.