10Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.
11“Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,
12unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.
13Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ.
14“Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu.