Ọpụpụ 13

Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.

Exodus 13:10 (UKJV) You shall therefore keep this ordinance in his season from year to year.

8Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’

9Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.

10Unu ga na-eme mmemme a nʼoge a kara aka nʼafọ ọbụla.

11“Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, nyefee unu ala ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha,

12unu ga-enyefe Onyenwe anyị ụmụ ndị ikom unu niile e bụ ụzọ mụọ. Ọzọ, ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ bụ nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.