Ọpụpụ 13

Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.

Exodus 13:4 (UKJV) This day came all of you out in the month Abib.

2“Dooro m nsọ onye ọbụla bụ ọkpara, onye ọbụla e bụ ụzọ mụọ nʼetiti ụmụ Izrel, na nʼetiti mmadụ ma nʼetiti anụ ụlọ, nke m ka ọ bụ.”

3Mosis gwara ndị Izrel sị, “Chetanụ ụbọchị taa, ụbọchị unu si nʼala Ijipt pụta, ala ebe unu bụ ndị ohu, nʼihi na Onyenwe anyị sitere nʼike aka ya dị ukwu kpọpụta unu site nʼebe ahụ. Unu erikwala achịcha ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee.

4Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.

5Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a.

6Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.