Ọpụpụ 13

Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.

Exodus 13:6 (UKJV) Seven days you shall eat unleavened bread, and in the seventh day shall be a feast to the LORD.

4Taa, nʼọnwa Abib, bụ ụbọchị unu na-ahapụ ala Ijipt.

5Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a.

6Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị.

7Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile.

8Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.