Ọpụpụ 14

Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.

Exodus 14:24 (UKJV) And it came to pass, that in the morning watch the LORD looked unto the host of the Egyptians through the pillar of fire and of the cloud, and troubled the host of the Egyptians,

22Ụmụ Izrel sitere nʼetiti osimiri ahụ gafee. Mmiri osimiri ahụ ghọọrọ mgbidi nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

23Mgbe ndị agha Ijipt na-achụ ha ọsọ hụrụ ha ka ha na-agafe, ha sogidere ha baa, ọ bụladị nʼetiti osimiri ahụ. Ndị agha Ijipt niile sooro ha, ya bụ, ụgbọ agha Fero, ndị agha ya na ndị na-agba ịnyịnya ya niile.

24Nʼisi ụtụtụ echi ya, Onyenwe anyị ledatara anya site nʼogidi igwe ojii ahụ na-enye ihe. O legidere ndị agha Ijipt anya, tinyekwa ha ụjọ nʼobi nke mere na ha amakwaghị onwe ha.

25O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.”

26Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.