Ọpụpụ 14

Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha.

Exodus 14:27 (UKJV) And Moses stretched forth his hand over the sea, and the sea returned to his strength when the morning appeared; and the Egyptians fled against it; and the LORD overthrew the Egyptians in the midst of the sea.

25O mebiri ụkwụ ụgbọ agha ha mee ka o siere ịnyịnya ha ike ịdọkpụ ụgbọ agha ndị ahụ. Mgbe ahụ, ndị Ijipt kwuru sị, “Ka anyị sinụ nʼịchụ ndị Izrel gbapụ, nʼihi na Onyenwe anyị na-alụrụ ha ọgụ, na-emegidekwa anyị.”

26Mgbe ụmụ Izrel gafesịrị ruo nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Setịpụ aka gị ọzọ ka mmiri ahụ kpuchigide ndị Ijipt, na ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya ya.”

27Mosis setịpụrụ aka nʼelu osimiri ahụ. Nʼụtụtụ ya, mmiri osimiri ahụ sọghachiri gaa ebe ọ nọ na mbụ. Ndị Ijipt chọsịrị ụzọ ha si agbapụ ike, ma Onyenwe anyị mere ka osimiri ahụ kpuchie ha.

28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.