29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.
30Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ.
31Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya.