Ọpụpụ 14

Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ.

Exodus 14:30 (UKJV) Thus the LORD saved Israel that day out of the hand of the Egyptians; and Israel saw the Egyptians dead upon the sea shore.

28Osimiri ahụ kpuchigidere ụgbọ agha ha niile, na ndị na-agba ịnyịnya, na ndị agha Fero niile ndị chụụrụ ụmụ Izrel baa nʼime osimiri ahụ. O nweghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.

29Ma ụmụ Izrel esitelarị nʼala nke mmiri kọrọ gafee osimiri ahụ. Mgbe ha na-agafekwa, akụkụ abụọ nke osimiri ahụ guzoro ọtọ dịka mgbidi, nʼaka nri ha ma nʼaka ekpe ha.

30Site nʼụzọ dị otu a, Onyenwe anyị zọpụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị Ijipt. Ụmụ Izrel hụkwara ozu ndị Ijipt nʼikpere mmiri osimiri ahụ.

31Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.