Ọpụpụ 14

Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.

Exodus 14:6 (UKJV) And he made ready his chariot, and took his people with him:

4Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.

5Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?”

6Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.

7Ọ chịịrị ụgbọ agha dị narị isii e leziri anya họpụta, tinyere ụgbọ agha Ijipt niile. Ndịisi agha ndị Ijipt nọcha nʼelu ha niile.

8Onyenwe anyị mere ka obi Fero eze Ijipt sie ike. Ọ chụsoro ụmụ Izrel, ndị na-aga nʼihu nʼije ha, na-atụghị egwu maọbụ ịda mba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.