Ọpụpụ 14

Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.

Exodus 14:4 (UKJV) And I will harden Pharaoh's heart, that he shall follow after them; and I will be honoured upon Pharaoh, and upon all his host; that the Egyptians may know that I am the LORD. And they did so.

2“Gwa ụmụ Izrel ka ha chigharịa azụ jee maa ụlọ ikwu ha na ncherita ihu Pi Hahirot, nke dị nʼetiti Migdol na osimiri. Ọ bụ nʼakụkụ osimiri, na ncherita ihu obodo Baal-Zefọn ka ha ga-ama ụlọ ikwu ha.

3Fero ga-asị banyere ụmụ Izrel, ‘Ha na-awagharị gburugburu ala ahụ nʼọnọdụ mgbagwoju anya ebe ọzara riri ha.’

4Aga m eme ka obi Fero sie ike ka ọ chụso unu ọsọ nʼazụ, ma m ga-ewetara onwe m otuto site na Fero na ndị agha ya niile. Ndị Ijipt niile ga-ama na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Ndị Izrel mekwara otu ahụ.

5Mgbe a gwara eze Ijipt na ndị a agbaala ọsọ, obi Fero na ndị ozi ya gbanwere megide ndị Izrel. Ha sịrị, “Gịnị bụ ihe anyị mere, site na izipụ ndị Izrel nʼọrụ ife anyị?”

6Na-atụfughị oge, Fero rigoro nʼelu ụgbọ agha ya, duru ndị agha ya ịchụso ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.