Ọpụpụ 15

Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe.

Exodus 15:10 (UKJV) You did blow with your wind, the sea covered them: they sank as lead in the mighty waters.

8I sitere na nkuume nke oghere imi gị, mee ka mmiri osimiri guzoro ọtọ. Mmiri ahụ na-erugharị erugharị guzoro nʼotu ebe dịka mgbidi; ogbu mmiri kpụkọtara rahụ nʼala ala nsọtụ nke osimiri.

9Onye iro nyara isi sị, ‘Aga m achụso ha, gafee ha. Aga m ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nyejuo onwe m afọ site na ha. Aga m amịpụta mma agha m. Jiri aka m laa ha nʼiyi.’

10Ma i kupụrụ ikuku si gị nʼimi pụta, osimiri riri ha, ha mikpuru nʼime osimiri ukwu ahụ dịka igwe.

11Onye dịka gị Onyenwe anyị, nʼetiti chi niile? Onye dịka gị? Onye dị ebube nʼịdị nsọ. Onye otuto ya na-eyi egwu. Onye na-arụ ọrụ dị ebube?

12“I setịpụrụ aka nri gị, ala meghere ọnụ ya loo ndị iro gị niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.