Ọpụpụ 15

Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.

Exodus 15:27 (UKJV) And they came to Elim, where were twelve wells of water, and threescore and ten palm trees: and they encamped there by the waters.

25Mosis tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa. Onyenwe anyị gosiri Mosis osisi ọ ga-atụnye nʼime mmiri ahụ. Mgbe Mosis mere otu a, mmiri ahụ malitere ịdị ụtọ ọṅụṅụ. Ọ bụkwa na Mara ka Onyenwe anyị nọ nye ha ụkpụrụ ya na iwu ya maka iji ya nwalee ha.

26Ọ sịrị, “Ọ bụrụ na unu ga-ege ntị nke ọma nʼokwu Onyenwe anyị Chineke unu, mee ihe ziri ezi nʼanya ya, ọ bụrụkwa na unu eleruo anya idebe iwu ya na ụkpụrụ ya niile, ọ dịghị ọrịa nke m tinyere nʼahụ ndị Ijipt nke m ga-etinye nʼahụ unu. Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye na-agwọ unu ọrịa niile.”

27Ha bịaruru nʼobodo Elim, ebe e nwere isi iyi mmiri ala na-asọpụta dị iri na abụọ, na iri osisi nkwụ asaa. Ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.