Ọpụpụ 16

Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”

Exodus 16:19 (UKJV) And Moses said, Let no man leave of it till the morning.

17Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.

18Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.

19Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”

20Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.

21Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.