Ọpụpụ 16

Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.

Exodus 16:18 (UKJV) And when they did mete it with an omer, he that gathered much had nothing over, and he that gathered little had no lack; they gathered every man according to his eating.

16Ihe ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ”

17Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta.

18Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị.

19Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.”

20Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.