26Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
27Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
28Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?
29Lee, Onyenwe anyị enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.”
30Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.