24Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.
25Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.
26Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”
27Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.
28Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m?