Ọpụpụ 16

Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.

Exodus 16:25 (UKJV) And Moses said, Eat that to day; in order to day is a sabbath unto the LORD: to day all of you shall not find it in the field.

23Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ”

24Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.

25Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.

26Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”

27Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.