Ọpụpụ 16

Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.

Exodus 16:24 (UKJV) And they laid it up till the morning, as Moses bade: and it did not stink, neither was there any worm therein.

22Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis.

23Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ”

24Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.

25Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa.

26Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.