30Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa.
31Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee.
32Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “Onyenwe anyị enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ”
33Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu Onyenwe anyị, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.”
34Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.