Ọpụpụ 16

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.

Exodus 16:4 (UKJV) Then said the LORD unto Moses, Behold, I will rain bread from heaven for you; and the people shall go out and gather a certain rate every day, that I may prove them, whether they will walk in my law, or no.

2Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.

3Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”

4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.

5Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.”

6Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ Onyenwe anyị dupụtara unu site nʼala Ijipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.