1Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt.
2Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn.
3Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na Onyenwe anyị gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.”
4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu.