Ọpụpụ 17

Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.

Exodus 17:13 (UKJV) And Joshua humiliated Amalek and his people with the edge of the sword.

11Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya.

12Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara.

13Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha.

14Emesịa, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.”

15Mosis wuru ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị. Ọ kpọrọ ya Onyenwe anyị Nisi, nke pụtara, Onyenwe anyị bụ ọkọlọtọ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.