Ọpụpụ 18

Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”

Exodus 18:14 (UKJV) And when Moses' father in law saw all that he did to the people, he said, What is this thing that you do to the people? why sit you yourself alone, and all the people stand by you from morning unto even?

12Jetro, nna nwunye Mosis chụọrọ Chineke aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ. Emesịa, Erọn na ndị okenye Izrel bịara soro Mosis na ọgọ ya nwoke rie ihe nʼihu Chineke.

13Nʼụbọchị nke ọzọ ya, Mosis bịara nọdụ ala ikpere ndị mmadụ ikpe. Igwe mmadụ nọgidere Mosis site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị.

14Ọgọ Mosis hụrụ ihe niile ọ na-emere ndị mmadụ, nke a mere na ọ jụrụ, “Gịnị bụ ihe nke a ị na-emere ndị a? Gịnị mere i ji nọdụ ala naanị gị, ndị a niile gbaa gị gburugburu malite nʼụtụtụ ruo nʼanyasị?”

15Mosis zara nna nwunye ya sị, “Nʼihi na ha bịara ịjụta m ihe si nʼaka Chineke.

16Ọ bụrụ na esemokwu adịrị nʼetiti mmadụ ọbụla na ibe ya, ha na-abịakwute m, ka m kpebie ihe dị nʼetiti mmadụ na ibe ya. Ana m eme ka ha mata iwu na ụkpụrụ Chineke.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.