Ọpụpụ 18

O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”

Exodus 18:6 (UKJV) And he said unto Moses, I your father in law Jethro am come unto you, and your wife, and her two sons with her.

4Aha nwa nwoke nke abụọ bụ Elieza, nke bụ, Onyenwe anyị bụ onye inyeaka m. Nʼihi na mgbe Mosis mụrụ Elieza o kwuru sị, “Chineke nna m bụ onye inyeaka m, nʼihi na ọ napụtara m site na mma agha Fero.”

5Jetro, ọgọ nwoke Mosis, bịakwutere ha nʼime ọzara. O dutere ụmụ ndị ikom Mosis abụọ na nwunye Mosis. Nʼoge ahụ, Mosis na ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu Chineke.

6O ziri Mosis ozi sị, “Mụ bụ Jetro ọgọ gị nwoke bịakwutere gị, nwunye gị na ụmụ gị abụọ sokwa m.”

7Nʼihi ya, Mosis gara zute ọgọ ya nwoke, kpọọ isiala nye ọgọ ya, sutu ya ọnụ. Emesịa, ọ kpọbatara ha nʼime ụlọ ikwu ya. Jetro na ọgọ ya Mosis kwurịtara okwu, jụọ ihe banyere otu ihe si agara ibe ha.

8Mosis kọọrọ nna nwunye ya ihe niile Onyenwe anyị mere Fero na ndị Ijipt niile nʼihi ndị Izrel. Ọ kọkwaara ya banyere ihe ndakwasị niile dakwasịrị ha nʼime ọzara, na otu Onyenwe anyị si napụta ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.