22Ọ bụladị ndị nchụaja ndị chọrọ ịbịaru Onyenwe anyị nso aghaghị ido onwe ha nsọ. Ma ọ bụghị otu a, Onyenwe anyị ga-eme ka ha niile nwụọ.”
23Mosis zaghachiri Onyenwe anyị sị, “Ndị mmadụ agaghị arịgota nʼugwu Saịnaị nʼihi na gị onwe gị adọọla anyị aka na ntị sị, ‘Kpaanụ oke gburugburu ugwu a, doo ya nsọ.’ ”
24Ma Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị: “Gbada gaa kpọgota Erọn ka gị na ya soro rigota nʼelu ugwu a. Ma lezie anya ka ndị nchụaja na ndị Izrel ghara irigota nʼebe a ịbịakwute Onyenwe anyị, ma ọ bụghị otu a, ọ ga-eji ike laa ha nʼiyi.”
25Ya mere, Mosis rịdakwuru ndị Izrel ga gwa ha.