5Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,
6ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”
7Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
8Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru.
9Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Lee, agaje m izute gị nʼime igwe ojii gbara ọchịchịrị. Achọrọ m ka ụmụ Izrel niile were ntị ha nụrụ mgbe m ga-agwa gị okwu, ọzọkwa, ka ha kwerekwa na gị ruo mgbe niile.” Mosis gwara ndị Izrel niile okwu nke Onyenwe anyị gwara ya.