Ọpụpụ 19

ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”

Exodus 19:6 (UKJV) And all of you shall be unto me a kingdom of priests, and an holy nation. These are the words which you shall speak unto the children of Israel.

4‘Unu onwe unu ahụla ihe m mere ndị Ijipt, hụkwa otu m siri buru unu na nku ugo, si otu a, dọtara unu onwe m.

5Nʼihi nke a, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi nke ọma ma debe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụ ihe onwunwe nke m dị oke ọnụahịa. Nʼezie, ụwa niile bụ nke m,

6ma unu ga-abụrụ m alaeze ndị nchụaja, na mba dị nsọ.’ Okwu ndị a ka ị ga-agwa ụmụ Izrel.”

7Mosis gara kpọkọta ndị okenye ndị Izrel, gwa ha okwu niile nke Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.

8Ndị mmadụ niile a jikwa otu olu zaghachi ya sị, “Ihe ọbụla Onyenwe anyị kwuru ka anyị ga-eme.” Mosis gwara Onyenwe anyị ihe niile ndị Izrel kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.