23O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.
24Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.
25Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.