Ọpụpụ 2

Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.

Exodus 2:24 (UKJV) And God heard their groaning, and God remembered his covenant with Abraham, with Isaac, and with Jacob.

22Zipọra mụtara nwa nwoke, onye Mosis kpọrọ aha ya Geshọm. Nʼihi na Mosis sịrị, “Abụ m onye ọbịa nʼala ndị ọzọ.”

23O ruo, mgbe ọtụtụ ụbọchị gara, Fero eze Ijipt nwụrụ. Nʼoge a, ụmụ Izrel nọ na-asụ ude nʼime ọnọdụ ịbụ ohu ha. Ha kwara akwa nke ukwuu. Akwa ha kwara ka e nyere ha aka nʼihi ọnọdụ ịbụ ohu ha ruru Chineke ntị.

24Chineke nụrụ ịsụ ude ha. O chetara ọgbụgba ndụ ahụ ya na Ebraham, na Aịzik, na Jekọb gbara.

25Chineke hụrụ ụmụ Izrel, ihe banyere ha metukwara ya nʼobi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.