14Gị akwala iko.
15Gị ezula ohi.
16Agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị.
17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”
18Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya,