Ọpụpụ 20

“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.

Exodus 20:2 (UKJV) I am the LORD your God, which have brought you out of the land of Egypt, out of the house of bondage.

1Chineke kwuru okwu ndị a niile sị:

2“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ibu ohu.

3“Ị gaghị enwe chi ọzọ tinyere m.

4Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.