Ọpụpụ 20

Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.

Exodus 20:21 (UKJV) And the people stood far off, and Moses drew near unto the thick darkness where God was.

19sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”

20Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.”

21Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.

22Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Gwa ụmụ Izrel okwu sị, ‘Unu onwe unu ahụla na m si nʼeluigwe gwa unu okwu.

23Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.