Ọpụpụ 20

Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.

Exodus 20:25 (UKJV) And if you will make me an altar of stone, you shall not build it of hewn stone: for if you lift up your tool upon it, you have polluted it.

23Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha.

24“ ‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu.

25Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.

26Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.