5Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị.
6Ma na egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu.
7Gị ejikwala aha Onyenwe anyị bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na Onyenwe anyị agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị.
8Cheta ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ.
9Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile.