22“Ọ bụrụ na mmadụ abụọ esite nʼịlụ ọgụ ha merụọ nwanyị dị ime ahụ, mee ka ime ahụ pụọ, ma nwanyị ahụ emerụghị nnukwu ahụ, di nwanyị ahụ ga-anara site nʼaka onye ahụ merụrụ nwunye ya ahụ ihe niile ọbụla o kwuru na a ga-akwụ ya, bụkwa nke ndị na-ekpe ikpe kpebiri.
23Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ a nwụọ nʼihi mmerụ ahụ ahụ e merụrụ ya, a ga-eme ka nwoke ahụ merụrụ ya ahụ nwụọ.
24Ọ bụrụ na ọ bụ anya ka a kụkpọrọ, anya nʼọnọdụ anya. Ọ bụrụkwa otu eze ka e tipụrụ, eze nʼọnọdụ eze. Otu ahụ kwa, aka nʼọnọdụ aka, ụkwụ nʼọnọdụ ụkwụ.
25Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.
26“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.