25Ịda ọkụ nʼọnọdụ ịda ọkụ, ọnya mma, nʼọnọdụ ọnya mma, ihe otiti nʼọnọdụ ihe otiti.
26“Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla esite nʼihe otiti o tiri ohu ya kụkpọọ ya anya, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya, maọbụ ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, nʼihi na o jirila anya ya gbara onwe ya.
27Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla etipụ eze ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, a ga-eme ka ohu ahụ nwere onwe ya nʼihi eze ya nke e tipụrụ.
28“Ọ bụrụ na ehi ejiri mpi ya sọda mmadụ si otu a mee ka onye ahụ nwụọ, a ga-atụgbu ehi ahụ na nkume. Mmadụ ọbụla agaghị erikwa anụ ehi ahụ. Ma a ga-agụ onyenwe ehi ahụ dịka onye ikpe na-amaghị.
29Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.