29Ọ bụrụ na ehi ahụ na-asọkarị ndị mmadụ mpi mgbe niile, agaghị eri anụ ya. Kama, ọ bụrụ na adọọla onyenwe ya aka na ntị banyere ehi ahụ ọtụtụ oge, ma o meghị ihe ọbụla banyere ya, a ga-eme ka ehi ahụ na onyenwe ya nwụọ.
30Ma ọ bụrụ na ndị nwe mmadụ achọọ ka a kwụọ ha ụgwọ kama igbu onyenwe ehi ahụ, ndị ikpe ga-ekpebi ego ole onyenwe ehi ga-akwụ ha.
31Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.
32Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.
33“Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,