31Otu a ka a ga-esikwa kpee ikpe nke ga-apụta ma ọ bụrụ na ehi asọda nwokorobịa maọbụ nwaagbọghọ ọbụla.
32Kama ọ bụrụ na ehi asọda ohu nwoke maọbụ ohu nwanyị, onyenwe ehi ahụ ga-akwụ onyenwe ohu ahụ iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Emesịa, a ga-eji nkume tugbuo ehi ahụ.
33“Ọ bụrụ onye ọbụla meghere olulu maọbụ gwuo olulu, ghara imechi ya, nke mere na ehi mmadụ maọbụ ịnyịnya ibu adaba nʼime ya,
34onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.
35“Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.