34onye ahụ gwuru olulu ahụ ga-akwụ onyenwe anụ ụlọ ahụ ọnụọgụgụ ego o jiri zụta ya. Mgbe ahụ ọ ga-eburu ozu anụ ahụ nwụrụ anwụ.
35“Ọ bụrụ na oke ehi mmadụ emerụọ oke ehi onye ọzọ ahụ, emesịa ehi dị otu a anwụọ, a ga-ere ehi nke dị ndụ, kewaa ego ya ụzọ abụọ. Otu a kwa, a ga-ekewa ehi nke nwụrụ anwụ, nye mmadụ abụọ ahụ otu ụzọ otu ụzọ.
36Ọ bụrụ na amaara na oke ehi ahụ na-asọ mpi mgbe niile nʼoge gara aga, ma onyenwe ya emeghị ihe ọbụla banyere ya, ọ ga-akwụzu ụgwọ ehi ahụ nwụrụ anwụ. Emesịa ehi ahụ nwụrụ anwụ ga-abụrụ nke ya.