Ọpụpụ 21

Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.

Exodus 21:4 (UKJV) If his master have given him a wife, and she have born him sons or daughters; the wife and her children shall be her master's, and he shall go out by himself.

2“Ọ bụrụ na ị goro ohu onye Hibru, ọ ga-agbara gị odibo afọ isii. Ma nʼafọ nke asaa, ọ ga-abụ onye nwere onwe ya laakwa nʼakwụghị ụgwọ ọbụla.

3Ọ bụrụ na sọọsọ ya bịara, sọọsọ ya ga-ala, ma ọ bụrụ na o nwere nwunye tupu ọ bụrụ ohu, ya na nwunye ya ga-eso ala.

4Ọ bụrụ na nna ya ukwu kpọnyere ya nwunye onye mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom, nwanyị ahụ na ụmụ ya ga-abụ nke nna ya ukwu, naanị nwoke ahụ ga-enwere onwe ya.

5“Ma ọ bụrụ na ohu ahụ asị, nʼezie, ‘Ahụrụ m onyenwe m na nwunye m na ụmụ m nʼanya, achọghị m inwere onwe,’

6mgbe ahụ, onyenwe ya ga-eduru ya bịakwute Chineke. Mgbe ọ kpọbatasịrị ya nʼọnụ ụzọ, onyenwe ya ga-eji agịga dupuo ntị ya. Malite nʼoge ahụ, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo ọgwụgwụ ndụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.